17 DAYS OF SPIRITUAL WISDOM

Igbo


Nkọwa Mmalite

Ọgbakọ Aetherius bụ ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke n’agba mbọ ma n’echukwa uchu maka nzọpụta imemmụọ nke mmadụ niile; ọ na-akụzikwa ihe omimi ndị ahụ mere Chukwu kere ụwa jị bụrụ Ọka-akaa.

Ọ bụ n’afọ 1955 ka Dọkịtọ George King bụ onye ọka mmụta imemmụọ, ma turukwa  akara ugo pụrụ iche na-ikụzi ihe omimi njikọta imemmụọ mmadụ na Chukwu bụ ‘yoga’ na mpaghara ọdịda anyanwụ  ụwa anyị a, hibere Ọgbakọ a.

Nkuzi Ọgbakọ Aetherius hinyere isi na-ime ka amamihe imemmụọ si n’aka ndi mmụọ ozi Chukwu dị elu si n’ụwaa, ya na ụwa ndị ọzọ ruo mmadụ niile ntị, site n’aka onye ozi ha bụ George King. Ọ bụ site na mmụta ihe omimi ọkara-mmụọ-ọkara-mmadụ ma ọ bụ – yogic mediumship- nke George King ka ndị mmụọ ozi Chukwu a ji ezitere anyị ozi ndịa.

Ọ bụghị ebum n’uche ndị ọkacha mara ndịa si n’ụwa ndị ọzọ, nke ọ na-abụ nke Ọgbakọ Aetherius ikpochapụ nkuzi imemmụọ ndị dịbu adị n’ụwaa. N’ezi okwu, ọ bụghị nanị na nkuzi Ọgbakọ Aetherius kwadoro nkuzi imemmụọ si n’aka ndị ozi Chukwu dịka Jesus, Sri Krishna, Buddha, na ndị oyiri ha ndị ọzọ; kama ọ na-akwadokwa, na-ebulite ma na-akọwakwa isi okwu dị na nkuzi ndịa ka ha pụta ìhè karịa. Ọgbakọ Aetherius kwenyesiri ike na-ndị ozi Chukwu ndịa niile si n’ụwa ndị ọzọ abịa n’ụwa anyịa.Otu ihe kwụchapụtara onwe ya na nkuzi Ọgbakọ Aetherius bụ nnukwu mkpa ọ dị, ya na uru pụkwara iche ịrụ ọrụ enyemaka nye mmadụ niile dị na-oge ugbu a. Nke a gosipụtara n’akpaala okwu e ji mara Ọgbakọ Aetherius nke bụ:

‘Ịrụ ọrụ enyemaka n’efu nye mmadụ niile chawapụrụ onwe ya na ime ihe niile mmadụ pụrụ ịmepụta na ndụ ya niile’

Ọgbakọ Aetherius anaghị ahụ onwe ya dịka nanị ụzọ ziri ezi na-akuzi nzọpụta na amamihe imemmụọ nke Chukwu. Ọ na-ahụ nkuzi ụka niile ama-ama dịka ikpere otu isi iyi nke ndụ ahụ bụ Chukwu nke na-enweghị isi mbido nke ọ na-enwe isi njedebe site na-ụzọ dị iche iche.

Na nkọwa, akara e ji mara Ọgbakọ Aetherius pụtara “Chukwu na-egozipụta onwe ya ka Amamihe,” Akara trayangụlụ dị n’aka nri bụ akara e ji mara amamihe, ebe ndị nke ọzọ niile chịkọtara ọnụ bụrụ akara dị nsọ e ji mararị Chukwu kamgbe gboo.

Isi Okwukwe Ọgbakọ Aetherius

Nkuzi na nkwenye Ọgbakọ Aetherius metụrụ aka ma chịkọtakwa ọtụtụ  nkuzi okwukwe, nkuzi ụka na okpukpere chi, nkuzi imemmụọ, na nkuzi ama-ama-amasị-amasị dị n’ime Chukwu; nke gbadosiri ụkwụ ike na ihe ndịa:-

Irụ ọrụ enyemaka n’efu nye mmadụ niile

Irụ ọrụ enyemaka n’efu nye mmadụ niile nke aha ọzọ e ji mara ya bụ “karma yoga” bụ ihe kachasị ibe ya na-ihe niile mmadụ pụrụ ime iji kwalite ọnọdụ imemmụọ ya. Ọ bụ kwa n’ịrụ ọrụ enyemaka n’efu nye mmadụ niile ka nkuzi na ọrụ Ọgbakọ Aetherius hinyere isi.

Yoga – Ihe Omimi Njikọta Imemmụọ Mmadụ Na Chukwu.

Ọtụtụ mmadụ n’ahụ ihe omimi nkwalite imemmụọ bụ yoga dịka otu n’ime ụzọ esi agbatị ahụ na akwara iji nwee ahụ isiike maka ịgbanarị nrịanrịa ime ahụ; ma nke bụ eziokwu bụ na yoga kwụchapụrụ onwe ya kamgbe gboo n’ụzọ niile ama ama nke mmadụ ji enwe nzọpụta imemmụọ nke hinyerekwara isi n’ịrụ ọrụ enyemaka n’efu nye mmadụ niile.

Ikikere Imemmụọ, Ekpere Na Igwo Oria

Ikikere imemmụọ bụ ike pụrụ iche ma n’emekwa ihe a hụrụ anya dị ka ikikere latriki si arụ ọrụ a hụrụ anya. Ikikere imemmụọ pụrụ ịgwọ onye ezigaara ya ọrịa; site n’imemmụọ duzie ya ụzọ; gbaa ya ume; chekwaa ma zọpụtakwa ya n’aka ndị ọjọọ. Onye ọbụla nwere ike imụta etu e si akpọku ikikere imemmụọa nke bụkwa ikikere ìhè na ihụnanya Chukwu, iji nyere onwe ya ma ọ bụ ndị ọzọ aka; ma nke kachasị nke bụ iji nyere ụwa niile aka.

Ekpere dị ire bụ mmadụ ikpọku ikikere imemmụọ Chukwu ma jikwa ya rụọ ọrụ ọma a hụrụ anya nye ebum n’uche ekpere ya. ‘Mantra’ ma ọ bụ ikpọku aha nsọ Chukwu dịka abụ, bụkwa otu n’ime ụzọ pụrụ iche e ji akpọku ma jirikwa ikikere a rụọ ọrụ ọma a hụrụ anya. Iji ikikere imemmụọ agwọ ndị ọrịa abụghị onyinye Chukwu nye mmadụ ole ma ole, kama ọ bụ onyinye ya nye mmadụ niile n’ụwaa. Onye ọbụla nwere ike ma kwesịkwa ịmụta ụdị ịgwọ ọrịaa ma jikwa ya nyere mmadụ niile aka n’efu. Ọgbakọ Aetherius na-akuziri onye ọbụla nwere mmasị ka e si eji ikikere imemmụọ agwọ ọrịa.

Mmụọ Nsọ Chukwu Dị N’ime Mmadụ

Ọdịdị anyị bụ mmadụ ya na nke ihe niile e kere eke dị nsọ dịka Chukwu siri dị nsọ, n’ihi na O kere anyị n’oyiri imemmụọ ya. Ihe niile ekere eke si na isiiyi nke ndụ bụ Chukwu pụta, ọ bụkwa n’otu isiiyi nke ndụa ka ihe nile ga alaghachi n’oge ikpeazụ. Aha e jiri mara isiiyi nke ndụ a baraụba dị ka okpukpere na ofufe ya siri baa ụba. Ụfọdụ n’ime aha ndịa bụ, Brahma, Jehova, God, Chukwu na aha ndị ọzọ gasị. Chukwu enweghị isi mbido nke ọ na-enwe isi njedebe. Ọ bụ ọka akaa, ike niile bụ nke ya. Chukwu mazu ihe niile ma nọzukwaa ebe niile, ma bụrụkwa ihe niile. Nke bụ eziokwu bụ na Chukwu karịrị ihe niile mmadụ sị na-ọbụ.

Ọ bụ site na-ịnya ụgbọ ndụ anyị na-uzọ ziri ezi ka anyị ga-eji nwee mgbanwe na nkwalite nke imemmụọ ma nwekwaa nghọta dị omimi banyere ọdịdị anyị n’ime Chukwu; nke ga-enye anyị nkwalite na ikikere nke imemmụọ n’enweghị atụ ma gbakwaa anyị ume pụrụ iche iji rụọ ọrụ enyemaka nye mmadụ niile n’efu.

Nduzi na ikikere imemmụọ

Ọ bụ ihe pụrụ omume anyị niile ịgbambọ ka nduzi na ikikere imemmụọ nke Chukwu di n’ime anyị pụta ìhè site n’ịrụ ọrụ enyemaka n’efu nye mmadụ niile ya na ịmụta ma na-ebikwa ndụ anyị n’usoro ihe omimi nkwalite imemmụọ agba ochie bụ ‘yoga’ n’ụdị ya dị iche iche.

Ụwa ndị ọzọ na ndị bi n’ime ha

Ụwa ndị agbataobi anyị nwechara ndị bi n’ime ha. Ndịa nwere amamihe; nghọta ihe omimi, na ọdịdị na ofufe Chukwu karịa anyị. Ụwa ndị agbataobia bụ ụwa ndị ha na ụwa anyịa n’agba anyanwụ anyịa gburugburu. Ndị ọkammụta nke nka-na-ụzụ ụwa anyịa enwebeghị ike ịhụ ndị agbataobi anyịa anya, n’ihi na ndị bi n’ụwa ndịa akarịala ndị eji anya nkịtị ahụ. Ndịa a marala Chukwu ruo ogo dị elu, nke mere na ndụ nkịtị a na-ahụ anya n’ụwa ha dịka ndụ imemmụọ dị omimi nke anyị apụghị ịhụ anya n’ụwa anyịa.

N’ Ọgbakọ Aetherius, ndị nkuzi ọkachamaraa si n’ụwa ndị ọzọ a bụ ndị a na-akpọ ndị nkuzi ama-ama-amasịamasị nke Chukwu ma ọ bụ ‘Cosmic Masters’. Mgbe ụfọdụ anyị na-etụkwa ha Chukwu, iji gosipụta na ha karịrị anyị ezigbo nkarị na mmụta ihe omimi imemmụọ ruo ogo dị elu, nke mere na ha dịka Chukwu n’ebe anyị nọ. Ọ bụ site n’obi ebere na-enweghị oyiri ka ndị nkuzi ama-ama-amasịamasị nke Chukwu ndịa ji ewere ụdị mmadụ n’ụwa anyịa, iji nyere anyị aka n’imirikiti ụzọ dị iche iche. Ewepụ ọrụ ebere ha na-arụ maka ọdịmma anyị, anyị na ụwa anyịa aka abụrụlarị ndị bibiri ebibi. Jesus, Buddha, Sri Patanjali, Sri Krishna, Confucius na Lao Zi bụ ụfọdụ ndi nkuzi ama-ama-amasịamasị nke Chukwu ama-ama weere ụdị mmadụ iji bịa nyere ụwa anyịa aka ma rụkwaa ọrụ ọma dịgasị iche iche.

Ndị nkuzi ama-ama-amasịamasị nke Chukwu a ji Ọgbakọ Aetherius akuziri ụwa anyịa ihe omimi na ọrụ imemmụọ nke Chukwu. “Ọpareshọn Preya Pawa” bụ otu n’ime ụzọ ọrụ nchekwa, ọrụ nkwalite na nzọputa imemmụọ ise pụrụ iche nke Ọgbakọ Aetherius n’arụ site na nduzi, nkwado na enyemaka ndị nkuzi ukwu a.

Anyanwụ anyịa na ụwa ndị na-agba ya gburugburu nke ụwa anyị bụ otu n’ime ha, bụ nanị otu n’ime imirikiti ọdịka ha n’ime ihe niile bụ ihe ndị a na-hụ anya Chukwu kere. Otua anyị si biri n’ụwa anyịa ka ndị dị iche iche ekere eke ndị ọzọ siri birigasịa n’ọtụtụ ụwa ndị ọzọa dị na mpụga. Ọtụtụ n’ime ndịa amụtalarị ihe omimi imemmụo dị elu ma n’ebi ndụ ha dịka Chukwu siri chọọ, ebe ụfọdụ ndị dịkwa ka anyị na-agbabeghị mbọ dịịrị ha iji nwee mbulielu nke imemmụọ.  Ọtụtụ n’ime ha  nwere obi ọma ma na-enyekwara ụwa ndị ọzọ aka na-ụzọ dị iche iche, ebe ụfọdụ ndị ọzọ gbara ajọ ma bụrụkwa ndị ọchọngaloko.

Ụgbo elu ọgbaraụwagharịị (UFOs)

Nke bụ eziokwu bụ na ụgbo elu ogbaraụwagharịị ndịa a na-ahụ n’eligwe anyị esilarị na-ọgbaraụwagharịị pụọ, n’ihi na Ọgbakọ Aetherius amatala ma na-akọwakwa na ụgbọ elu ndịa si n’ụwa ndị ọzọ akpa ụwa anyịa nso. Kemgbe gboorị ka ụdị ụgbọ elu ndịa ji na akpa ụwa anyị nso. N’ime edemede Bịble, akpọgasịrị ụgbọ elu ndịa aha dịgasị iche iche dịka: urukpu ọkụ, kpakpando, ya na ihe ufe gbaragharịị. Na akwụkwọ nkuzi ụka ndị Hindu, a kpọrọ ya: vimana.

Iwu ometaraburu na ịlọụwa

Otu n’ime iwu Chukwu na-achị ihe niile e kereke bụ iwu ometaraburu nke a n’akpọkwa ‘Karma’. Iwu Chukwu a, abụghị maka ịta mmadụ ahụhụ ọbụla, kama ọ bụ iji kụziere anyị nkuzi pụrụiche nye usoro anyị kwesịrị iji bie ndụ, nke

ga-enyere ihe niile ekere eke aka na okporo njem anyị n’ịlakwuru Chukwu kere anyị site na obibindụ ọma na nghọta omimi imemmụọ nke ya.

Ịlọụwa abụghị ntị ọhụrụ nye onye Igbo ọbụla. Ihe bụ ntị ọhụrụ bụ nkọwapụta ihe ịlọụwa pụtara, ya na ezigbo mkpa ọ dị n’ime njem anyị ji alakwuru Chukwu kere anyị. Dịka anyị maara, ihe niile Chukwu kere nwere ọdịdị abụọ; ọdịdị nke a na-ahụ anya ya na ọdịdị imemmụọ nke a naghị a hụ anya. Ọ bụkwa n’otu aka ahụ ka ụwa anyịa si nwee ọdịdị nke a na-ahụ anya ya na ọdịdị nke imemmụọ nke a naghị ahụ anya. Obibi anyị na ụwaa gbakwara mkpị abụọ: nke a na-ahụ anya ya na nke a naghị ahụ anya; ha abụọ jikọtakwara aka wee bụrụ ebe ọmụmụihe nke ndụ anyị. Mgbe mmadụ nwụrụ n’ụwa a na-ahụ anya, ọ na-ewere ahụ imemmụọ ya bụ ahụ a naghị ahụ anya ji birikwa ndụ imemmụọ ma ka na  amụkwa ihe nke ndụ ya na-ga n’ime ụwa imemmụọ nke ụwa anyịa wee ruo mgbe ọ ga alọ ụwa ọzọ. Ọ bụ site na njem anwụọ-alọụwa, anwụọ-alọụwaa ka anyị niile Chukwu kere n’esi amụta ihe omimi ndị ahụ na-akwalite ọnọdụ imemmụọ anyị n’usoro n’usoro wee ruo mgbe anyị mụtachara ihe niile dịmkpa anyị kwesịrị ịmụta na ndụ anyị n’ụwaa.

Onye ọbụla ruru ogo mmụta imemmụọ dị otua, na ahapụ ụwa anyịa ma malite ibi ndụ ya n’otu n’ime ụwa ndị agbata obi anyị, nke ga-eme ka ọ bụrụ otu n’ime ndị nkuzi ama-ama amasịamasị nke Chukwu mgbe na-adịghị anya. Ụfọdụ ndị tozuru ogoa n’eji afọọma ha ka nọrọkwa ka ndị ozi nchekwata na nduzi Chukwu nke ụwaa nke a na-akpọ ‘Ascended Masters’  iji nyere anyị aka n’ịgbambọ nzọpụta anyị.

Site na- echiche, ndụ, na omume ọjọọ anyị bụ mmadụ kambge gboo, ibu arụ dị ukwuu dịịrị anyi n’usoro iwu ometaraburu nke Chukwu. Nkea bụkwa nnukwu ọgbatauhie nye ndị nkuzi ama-ama amasịamasị nke Chukwu a ịpụta ìhè nyere anyị aka a hụrụ anya ka o siri dị ha n’obi. Ọkpụrụkpụ ọrụ Ọgbakọ Aetherius gbadosịrị ụkwụ ike na-ime ka ibu dịịrị mmadụ n’usoro iwu omeretaraburu nke Chukwu n’ụwaa dịlata nfe, site n’ịrụ ọrụ nchekwa, ọrụ nkwalite na ọrụ nzọpụta imemmụọ nke mmadụ niile dịgasị iche iche, site na nduzi, nkwado na enyemaka ndị nkuzi ama-ama amasịamasị nke Chukwu.

Ikikere Kundalini, oghere Chakras na ahụ inyoño mmadụ

Mmadụ niile nwere ahụ inyoño na-agbanyeghị ma anyị na-ahụ ya anya ma ọ bụ mba. Ahụ ịnyoño mmadụ dịka ka ikụkụ nke mmadụ na-enweghị ike ijide aka. Na agbanyeghị nkaa, ahụa kwụsiri ike n’onwe ya ma e jiri anya imemmụọ lee ya, n’ihi na ọ bụ ahụ ụwa imemmụọ. Ọ bụ site n’oghere chakra hagasị, ma ọ bụ ‘psychic centers’ ndị dị n’ahụ ịnyoño anyị ma gbadogasịe akwara  n’opi ọkpụkpụ azụ mmadụ ka ụma, nkwalite, nduzi na ikikere imemmụọ Chukwu si abanye ma n’apụkwa n’ime mmadụ.

Ikikere Kundalini bụ ikikere imemmụọ Chukwu dị omimi nke O hibere  n’ọdụ mmadụ ebe ọkpụkpụ azụ jedebere. Aha ọzọ a na-akpọ ikikere kundalini bụ ‘serpent power’ nke pụtara ‘ike agwọ’; iji gosi na ike a na-eme njem dịka ọ bụ agwọ na-arịgo n’opi ọkpụkpụ azụ mmadụ.  Mgbe ọbụla ikikere kundalinia kuliri njem ịrịgo opi ọkpụkpụ azụ mmadụ, ọ na-emehe oghere chakra ọbụla nke o ruru na ya n’usoro usoro, meheruo ya n’isi. Nkea na-eme ka ụma, nkwalite, nduzi, ikikere na nghọta ihe omimi imemmụọ Chukwu na-enweghị atụ were ọnọdị n’ime onye ahụ. Onye dị otu a eturula akara ọkara-mmụọ-ọkara mmadụ.

Ọ bụ oke na ọrụ dịịrị mmadụ bụ ịhụ na ikikere kundalini si n’ude ya dị n’ọdụ ọkpụkpụ azụ anyị gbagoro ma mehechakwaa oghere chakra dum dị n’ahụ anyị na-otu na-otu ruo na chakra nke dị n’opuniisi anyị. Onye ọbụla nwere ike ime nke a kwamgbe kwamgbe, e ruola ogo mmụta imemmụọ na amamihe ihe omimi Chukwu nke ga eme ka ọ hapụ ụwa anyịa ma bidokwa ibi ndụ ya n’otu n’ime ụwa ndị agbata obi anyị dịka otu n’ime ndị nkuzi ama-ama amasịamasị nke Chukwu.  Ịmanye ikikere kundalini ka o kulie njem bụ ihe jọgburu onwe ya nke na-ebute ihe ọghọm dị egwu n’ahụ mmadụ;  Ọgbakọ Aetherius akwadoghị nke a ma ọlị ma ọlị. Ihe ha kwadosiri ike bụ mmadụ ịrụ ọrụ enyemaka n’efu nye ụwa niile nke na-eme ka ikikere kundalini kulie njem ya n’onwe ya ma jikwa nwayọ nwayọ ruo chakra opuniisi dịka Chukwu si chọọ ya, na-enweghị nsogbu ọbụla.

Nd Ozi Nchekwa Na Nduzi  Chukwu Nke Ụwaa ‘Ascended Masters’

Mmadụ niile bi n’ụwaa na-anwụ ma na-alọkwa ụwa iji nwee mụtazuo ihe niile anyị kwesịrị ịma dịka iwu ometaraburu nke Chukwu siri chọọ maka ọdịmma nke imemmụọ anyị. Onye ọbụla tozuru na-ịkwụsị njem anwụọ-alọụwa anwụọ-alọụwa n’ụwa anyịa nwere mmasị ịhọrọ ibi ndụ ya n’otu n’ime ụwa ndị agbata obi anyị, ma ọ bụ ị nọrọkwa ka otu n’ime ndị ozi nchekwa na nduzi ụwaa, iji nyere ndị mmadụ aka na-ịgbambọ nzọpụta imemmụọ ha . Ndị dị otu a akarịala ọnwụ; ha nwekwara ikikere imemmụọ dị ukwuu ma nke ka nke bụ na ha nwere obi ebere na-enweghị atụ n’ebe anyị nọ ma nwekwaa amamihe na nghọta nke Chukwu pụrụ iche. Ndị ozi nchekwa na nduzi Chukwu nke ụwaa a na-ekwu maka ha na anọ ọtụtụ afọ kwuru afọ ma dịkwa ka ha dị, n’ihi na ha anaghịkwa aka nka ma ọlị ma ọlị. Ha nwekwara ike ịgbanwe ahụ ha ma ha chọọ dịka ha si eme mgbe ụfọdụ, ma ka bụrụkwa nwoke ma ọ bụ nwanyị tozuru etozu.

Nne Nwanyi Bụ Ụwa Anyia

Ụwa anyịa bụ nnukwu nwanyị obi ebere, onye jiri njem mbulielu o ji alakwuru Chukwu kere ya chụọ aja ka anyị bụ mmadụ nwee ebe obibi, n’agbanyeghị ajọ ndụ na amaghị ihe imemmụọ nke anyị. Ọgbakọ Aetherius n’agbambọ n’ụzọ dị iche iche iji nye aka mee ka ọrụ ọmiiko ukwua nne nwanyi a bukwasịrị onwe ya maka ọdịmma nke mmadụ dịrị ya nfe.

Ugwu Ebube Nsọ (Holy Mountains)

Ugboro ugboro n’afọ Ọgbakọ Aetherius na-eme njem nkwalite okwukwe site n’ịrịgo ugwu ebube nsọ dị iche iche ebe ha na e ji ekpere, mantra, na elilereanya imemmụọ (bụ visualization) ji kpọkuo ma zipụkwa ikikere imemmụọ dị nsọ juru n’ugwu ndịa iji nyere ndị mmadụ dum na uwa anyịa aka.  Ọ bụ ndị nkuzi ama-ama amasịamasị nke Chukwu na ndị ozi nchekwa na nduzi ụwaa, mere ka ugwu ebube ndịa jupụta n’ikikere mmụọ-nsọ Chukwu, site n’otu n’ime ọrụ nzọpụta ụwa nke Ọgbakọ Aetherius a na-akpọ “Ọpareshọn Starlight” nke dọkpụgharịrị Dọkitọ George King bụ onye ha jịrị mere ngwaọrụ jee ọtụtụ obodo ụwa anyịa, nke were ya afọ atọ na ụma.

Jee n’ọnyanwaudide anyị: [email protected] ka mtakwuo maka Ọgbakọ Aetherius.